Genesis 5

Site nʼAdam ruo Noa

1Nke a bụ usoro ihe ndepụta banyere agbụrụ Adam.

Mgbe Chineke kere mmadụ, o kere ya nʼoyiyi Chineke.
2O kere ha nwoke na nwanyị, gọziekwa ha. Mgbe e kere ha, ọ kpọrọ ha mmadụ.

3Mgbe Adam gbara narị afọ na iri afọ atọ, ọ mụrụ nwa ya nwoke nʼoyiyi nke ya, na nʼụdịdị nke ya. Ọ gụrụ ya Set. 4Site nʼoge a mụrụ Set, Adam dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 5Adam nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ atọ.
6Set gbara narị afọ na ise mgbe ọ ghọrọ nna Enọsh, 7Mgbe ọ ghọchara nna Enọsh, Set dịrị ndụ ruo narị afọ asatọ na asaa ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 8Set nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ na abụọ.
9Mgbe Enọsh gbara iri afọ itoolu, ọ ghọrọ nna Kenan. 10Mgbe ọ ghọchara nna Kenan, Enọsh dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ na ise, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 11Enọsh nwụkwara mgbe ọ nọzuru narị afọ itoolu na afọ ise.
12Mgbe Kenan gbara iri afọ asaa ka ọ ghọrọ nna Mahalalel. 13Mgbe ọ ghọchara nna Mahalalel, Kenan dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ anọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 14Kenan nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na afọ iri.
15Mgbe Mahalalel gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Jared. 16Mgbe ọ ghọchara nna Jared, Mahalalel dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ atọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 17Mahalalel nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ asatọ na iri afọ itoolu na ise.
18Mgbe Jared dị narị afọ na iri afọ isii na abụọ ka ọ ghọrọ nna Enọk. 19Mgbe ọ ghọchara nna Enọk, Jared dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 20Jared nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na abụọ.
21Mgbe Enọk gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Metusela. 22Mgbe ọ ghọchara nna Metusela, Enọk soro ụzọ Chineke narị afọ atọ. Nʼoge a, ọ mụtara ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 23Ọnụọgụgụ nke afọ niile Enọk biri ndụ, bụ narị afọ atọ na iri afọ isii na ise. 24Enọk soro ụzọ Chineke ruo na a hụkwaghị ya nʼihi na Chineke kpọọrọ ya.
25Mgbe Metusela gbara narị afọ na iri afọ asatọ na asaa ka ọ ghọrọ nna Lamek. 26Mgbe ọ ghọchara nna Lamek, Metusela dịrị ndụ narị afọ asaa na iri afọ asatọ na abụọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 27Metusela nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na itoolu.
28Mgbe Lamek gbara narị afọ na iri afọ asatọ na abụọ ka ọ mụtara nwa nwoke. 29Lamek gụrụ ya Noa, nʼihi na ọ sịrị: “Ọ ga-akasị anyị obi nʼime oke ọrụ na ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ nʼala a Onyenwe anyị bụrụ ọnụ.” 30Mgbe a mụsịrị Noa, Lamek dịrị ndụ narị afọ ise na iri afọ itoolu na ise ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom. 31Lamek nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ asaa na iri afọ asaa na asaa.
32Mgbe Noa gbara narị afọ ise ọ ghọrọ nna Shem, Ham na Jafet.
Copyright information for IboBIU